Jeremiah 14

Ụkọ mmiri, ụnwụ na mma agha

1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke rutere Jeremaya banyere ụkọ mmiri.

2“Juda na-eru ụjụ,
ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya.
Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ,
ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.
3Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri.
Ha na-aga nʼolulu mmiri
ma o nweghị mmiri ha na-achọta.
Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta.
Ha ji aka ha kpuchie isi ha
nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.
4Ala na-agbawa
nʼihi enweghị mmiri ozuzo.
Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha
nʼihi obi ọjọọ ha.
5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa,
na-ahapụ nwa ọhụrụ ya,
nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị.
6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị.
Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa;
anya ha adabamiela ha nʼisi
nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”

7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama,
Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị.
Anyị emehiela megide gị.
Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.
8Gị, onye bụ olileanya Izrel.
Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ,
gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a,
dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị?
9Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede,
dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta?
Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị;
ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị.
Ahapụkwala anyị!
10Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a,

“Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu.
Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe.
Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ.
Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha,
ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”
11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a. 12Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”

13Ma asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Lee na ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha anya, maọbụ hụ ahụhụ nke ụnwụ na-eweta, nʼeziokwu, aga m enye unu udo nke na-adịgide adịgide nʼebe a.’ ”

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara. 15Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma nʼaha m. Ọ bụghị m ziteere ha, ma ha nọgidere na-asị, ‘Mma agha na ụnwụ enweghị ike ịbịaru ala a nso.’ Ndị amụma a niile ka a ga-ebibi site na mma agha na ụnwụ. 16A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.

17“Gwa ha okwu ndị a,

“ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda
ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị,
nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke,
ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu,
ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ.
18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo
ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo;
Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu,
ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara.
Ma onye amụma ma onye nchụaja
agaala nʼala nke ha amaghị.’ ”

19Ị jụla Juda kpamkpam?
Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ?
Gịnị mere i ji tigbuo anyị
ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị?
Anyị lere anya udo,
ma ọ dịghị ezi ihe bịara;
anyị lere anya ọgwụgwọ,
ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu.
20 Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị,
na ikpe mara nna nna anyị ha;
nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.
21Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị.
Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ.
Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara;
emebikwala ya.
22Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo?
Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị?
Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a.
Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị,
nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.
Copyright information for IboBIU